7 i gējisi kwa ike izí ha-umu-gi, i gēkwu kwa okwu bayere ha mb͕e i nānọdu n'ulo-gi, na mb͕e i nēje ije n'uzọ, na mb͕e i nēdina ala, na mb͕e i nēbili ọtọ.
8 I gēke kwa ha n'elu aka-gi ka ha buru ihe-iriba-ama, ha gābu kwa nkpọ-n'iru n'etiti anya-gi abua.
9 I gēdekwasi kwa ha n'awara-uzọ abua nke ulo-gi, na n'ọnu-uzọ-ama-gi nile.
10 O gēru kwa, mb͕e Jehova, bú Chineke-gi, gēme ka i ba n'ala ahu nke Ọ ṅuru nna-gi-hà, bú Abraham, na Aisak, na Jekob, iyi, inye gi; obodo uku di iche iche ma-kwa-ra nma, nke i nēwughi,
11 na ulo juputara n'ezi ihe nile, nke i nēmejughi, na olùlù-miri egwuwara egwuwa, nke i nēgwuwaghi, na ubi-vine na osisi olive, nke i nākughi, mb͕e i gēri kwa, afọ eju kwa gi;
12 gi lezie onwe-gi anya, ka i ghara ichezọ Jehova, Onye mere ka i si n'ala Ijipt, si kwa n'ulo ndi-orù, puta.
13 Jehova, bú Chineke-gi, ka i gātu egwu; ọ bu kwa Ya ka i gēfè òfùfè, ọ bu kwa aha-Ya ka i gēwere ṅu iyi.