6 I mawo kwa na ọ bughi n'ihi ezi omume-gi ka Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi ezi ala nka ka i nweta ya; n'ihi na ndi kwesiri olu ike ka i bu.
7 Cheta, echezọla, ihe nke i ji kpasu Jehova, bú Chineke-gi, iwe n'ọzara: site n'ubọchi mb͕e i si n'ala Ijipt puta, rue mb͕e unu biaruru ebe a, ndi nānupu isi ka unu buworo n'ebe Jehova nọ.
8 Na Horeb ka unu kpasu-kwa-ra Jehova iwe, Jehova we wesa unu iwe ikpochapu unu.
9 Mb͕e m'rigoro n'ugwu inara mbadamba nkume abua ahu, bú mbadamba nkume nke ọb͕ub͕a-ndu ahu nke Jehova b͕ara nye unu, m'we nọdu n'ugwu ahu ọgu ubọchi abua ehihie na abali; ọ dighi nri m'riri, ọ dighi kwa miri m'ṅuru.
10 Jehova we nyem mbadamba nkume abua ahu nke ewere nkpisi-aka Chineke de; edekwasi-kwa-ra n'elu ha dika okwu nile si di nke Jehova gwara unu n'ugwu ahu site n'etiti ọku ahu n'ubọchi nkpọkọta ahu.
11 O rue, n'ọgwugwu ọgu ubọchi abua, ehihie na abali, na Jehova nyerem mbadamba nkume abua ahu, bú mbadamba nkume nke ọb͕ub͕a-ndu ahu.
12 Jehova we sim, Bilie, si n'ebe a rida ngwa ngwa; n'ihi na ndi-gi, nke i meworo ka ha si n'Ijipt puta, ebibiwo onwe-ha; ha esiwo n'uzọ nke M'nyere ha n'iwu wezuga onwe-ha ngwa ngwa; ha emeworo onwe-ha nwa-ehi awuru awu.