8 Na Horeb ka unu kpasu-kwa-ra Jehova iwe, Jehova we wesa unu iwe ikpochapu unu.
9 Mb͕e m'rigoro n'ugwu inara mbadamba nkume abua ahu, bú mbadamba nkume nke ọb͕ub͕a-ndu ahu nke Jehova b͕ara nye unu, m'we nọdu n'ugwu ahu ọgu ubọchi abua ehihie na abali; ọ dighi nri m'riri, ọ dighi kwa miri m'ṅuru.
10 Jehova we nyem mbadamba nkume abua ahu nke ewere nkpisi-aka Chineke de; edekwasi-kwa-ra n'elu ha dika okwu nile si di nke Jehova gwara unu n'ugwu ahu site n'etiti ọku ahu n'ubọchi nkpọkọta ahu.
11 O rue, n'ọgwugwu ọgu ubọchi abua, ehihie na abali, na Jehova nyerem mbadamba nkume abua ahu, bú mbadamba nkume nke ọb͕ub͕a-ndu ahu.
12 Jehova we sim, Bilie, si n'ebe a rida ngwa ngwa; n'ihi na ndi-gi, nke i meworo ka ha si n'Ijipt puta, ebibiwo onwe-ha; ha esiwo n'uzọ nke M'nyere ha n'iwu wezuga onwe-ha ngwa ngwa; ha emeworo onwe-ha nwa-ehi awuru awu.
13 Jehova we gwam okwu, si Ahuwom ndi nka, ma, le, ndi kwesiri olu ike ka ọ bu:
14 ram aka, ka M'we kpochapu ha, hichapu kwa aha-ha n'okpuru elu-igwe: M'gēme kwa gi ka i buru mba di ike ba kwa uba kari ha.