11 Obodo nka agaghi-aghọrọ unu ite, unu onwe-unu agaghi-aghọ kwa anu n'etiti ya; n'ókè-ala Israel ka M'gekpe unu ikpe;
12 unu ewe mara na Mu onwem bu Jehova: n'ihi na n'ukpurum nile ka unu nējegharighi, ọ bu kwa ihe nile nke M'kpere n'ikpe ka unu nēmeghi, kama ọ bu dika ikpé nile nke mba nile nke di unu buruburu si di ka unu meworo.
13 O rue, mb͕e M'buru amuma, na Pelataia nwa Benaia nwuru. M'we da kpue irum n'ala, tie nkpu n'oké olu, si, Ewó, Onye-nwe-ayi Jehova! ọ̀ bu ka ndi Israel fọduru gwusia ka Gi onwe-gi nēme?
14 Okwu Jehova we ruem nti, si,
15 Nwa nke madu, umu-nne-gi, ọbuná umu-nne-gi, bú ndi-nb͕aputa-gi, na ulo Israel nile, ha nile, ọ bu ha ka ndi bi na Jerusalem siri, Sinu n'ebe Jehova nọ je n'ebe di anya; ọ bu ayi ka enyeworo ala nka ka ọ buru ihe-nnweta:
16 n'ihi nka si, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Ebe M'meworo ka ha je n'ebe di anya n'etiti mba nile, ebe M'chusawo-kwa-ra ha n'ala nile, M'gāghọ-kwa-ra ha ebe nsọ nwa mb͕e ntà n'ala nile ebe ha bàworo.
17 N'ihi nka si, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: M'gāchikọputa unu nime ndi nile di iche iche, me kwa ka unu si n'ala nile ebe achusaworo unu zukọta, M'gēnye kwa unu ala Israel.