1 O rue, n'arọ nke-iri-na-otù, n'ubọchi mbu nke ọnwa, na okwu Jehova rurum nti, si,
2 Nwa nke madu, n'ihi na Taia ekwuwo okwu megide Jerusalem, si, Ehe, etipiawo ya, bú obodo nke bu ọnu-uzọ ndi nile di iche iche; o chighariwo n'ebe m'nọ: m'gēju eju, emewo ya nkpọnkpọ ebe:
3 n'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: Le, Mu nēmegide gi, Taia, M'gēme kwa ka ọtutu mba rigota imegide gi, dika oké osimiri si eme ka nmali-miri-ya nile rigota.
4 Ha gēbibi kwa mb͕idi nile nke Taia, kwatue ulo-elu-ya nile: M'gākọchapu kwa ájá-ya n'aru ya, me ya ka ọ ghọ nkume di elu nke ihe nādighi ya.
5 Ebe ib͕asa ub͕u ka ọ gābu n'etiti oké osimiri; n'ihi na Mu onwem ekwuwo okwu, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta): ọ gāghọ-kwa-ra mba nile ihe-nluta-n'agha.
6 Ma umu-ya ndinyom ndi nọ n'ọhia, agēji mma-agha b͕ue ha: ha ewe mara na Mu onwem bu Jehova.
7 N'ihi na otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Le, M'gaje ime ka Nebukadreza, bú eze Babilon, si n'Ugwu biarue Taia, ọ bu eze nke ndi-eze, ọ gāchiri inyinya, chiri kwa ub͕ọ-ala, chiri kwa ndi-inyinya na nkpọkọta madu na ndi bara uba, bia.