6 Ma umu-ya ndinyom ndi nọ n'ọhia, agēji mma-agha b͕ue ha: ha ewe mara na Mu onwem bu Jehova.
7 N'ihi na otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Le, M'gaje ime ka Nebukadreza, bú eze Babilon, si n'Ugwu biarue Taia, ọ bu eze nke ndi-eze, ọ gāchiri inyinya, chiri kwa ub͕ọ-ala, chiri kwa ndi-inyinya na nkpọkọta madu na ndi bara uba, bia.
8 Umu-gi ndinyom ndi nọ n'ọhia ka ọ gēji mma-agha b͕u: ọ gēwu kwa ulo-agha megide gi, wukọta obo-ihe imegide gi, welie ọta uku imegide gi.
9 Ọzọ, ihe-ya eji akwatu mb͕idi ka ọ gādọba imegide mb͕idi-gi nile, ọ bu kwa ulo-elu-gi nile ka o gēji mma-agha-ya kwada.
10 Site n'ìgwè inyinya-ya ájá-ha gēkpuchi gi: site n'olu ndi-inyinya, na nke wheel nākpọre akpọre, na nke ub͕ọ-ala, mb͕idi-gi nile gēme nkpatu, mb͕e ọ nābata n'ọnu-uzọ-ama-gi nile, dika esi abata n'obodo nke ab͕awara ab͕awa.
11 O gēji ukwu inyinya-ya nile zọtọ èzí-gi nile: ndi-gi ọ gēji mma-agha b͕u, ogidi nile nke ike-gi gārida n'ala.
12 Ha gākwata àkù-gi, luta ihe-izu-ahia-gi n'agha, kwatu mb͕idi-gi nile, ọ bu kwa ulo nile nke i nāchọsi ike ka ha gākwada: ọzọ, nkume-gi nile na osisi-gi nile awara awa na ájá-gi ka ha gātọb͕ọ n'etiti miri.