12 ọ bu site na mma-agha nile nke ndi-dike ka M'gēme ka ìgwè ndi-gi da; ndi kariri mba nile n'ime ka madu ma jijiji ka ha nile bu: ọ bu kwa ihe-npako nke Ijipt ka ha gāpunara ya, ewe kpochapu ìgwè ndi-ya nile.
13 M'gēme kwa ka anumanu-ya nile si n'akuku ọtutu miri la n'iyì; ukwu madu agaghi-ab͕aru kwa ha ọzọ, ukwu anumanu agaghi-ab͕aru kwa ha.
14 Mb͕e ahu ka M'gēme ka miri-ha do, me kwa ka osimiri nile ha rùe erù dika manu; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.
15 Mb͕e m'gēme ala Ijipt ebe tọb͕ọrọ n'efu na ihe-iju-anya, ala b͕a aka n'ihe juru ya-ri, mb͕e M'gētib͕u ndi nile bi ya, ha ewe mara na Mu onwem bu Jehova.
16 Abù-ákwá ka nka bu, nke ha gābù; umu-ndinyom nke mba nile gābù ya: n'ihi Ijipt na n'ihi ìgwè-ya nile ka ha gābù ya; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.
17 O rue, n'arọ nke-iri-na-abua, n'ubọchi nke-iri-na-ise ọnwa ahu, na okwu Jehova rurum nti, si,
18 Nwa nke madu, bùara ìgwè ndi Ijipt abù ákwá, me ka ha rida, ya na umu-ndinyom nke mba di iche iche di ebube, rue ala di n'okpuru uwa, ha na ndi nārida n'olùlù.