18 Ọ bu kwa ihe emeworo ka o yie cherubim na nkwu; otù nkwu di n'etiti cherub na cherub, iru abua ka cherub ọ bula nwere;
19 iru madu we che iru na nkwu ahu di n'otù akuku, iru nwa-ọdum che-kwa-ra iru na nkwu ahu nke di n'akuku nke-ọzọ: otú a ka emere ya n'ulo ahu nile buruburu n'akuku nile.
20 Site n'ala rue elu ọnu-uzọ-ya ka cherubim na nkwu nke emere eme di: otú a ka mb͕idi nke ulo uku Chineke di.
21 Ma ulo uku Chineke ahu, akuku-ọnu-uzọ-ya nwere akuku anọ ra nrata; na iru ebe nsọ ya, n'ile ya anya ọ di ka ulo uku Chineke si di n'ile ya anya.
22 Ebe-ichu-àjà-ya bu osisi, cubit atọ n'idi-elu-ya, ogologo-ya di kwa cubit abua: ọ nwe-kwa-ra nkuku-ya anọ; ogologo-ya na akuku-ya nile bu kwa osisi: o we gwam okwu, si, Nka bu table ahu nke di n'iru Jehova.
23 Ọ bu kwa ọnu-uzọ abua ka ulo uku Chineke na ebe nsọ ya nwere n'otù n'otù.
24 Ọ bu kwa ibo-ọnu-uzọ abua ka ọnu-uzọ ndia nwere n'otù n'otù, bú ibo-ọnu-uzọ abua nke nāga buruburu; ibo-ọnu-uzọ abua diri otù ọnu-uzọ, ibo-ọnu-uzọ abua di-kwa-ra ọnu-uzọ nke-ọzọ.