17 Ngwe-ya di kwa cubit iri na anọ n'ogologo-ya, na cubit iri na anọ n'obosara-ya n'akuku anọ ya rara nrata, ókè nke di ya buruburu di kwa nkera cubit; ala o nwere di kwa otù cubit buruburu; ihe-nrigo-ya nēche iru n'Iru-anyanwu.
18 O we sim, Nwa nke madu, otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Ndia bu ukpuru nke ebe-ichu-àjà nkem n'ubọchi ha gēme ya, isure àjà-nsure-ọku n'elu ya, na iwusa ọbara n'elu ya.
19 I gēnye kwa ndi-nchu-àjà, bú ndi Livai ndi sitere na nkpuru Zedok, ndi dim nso, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta), ijerem ozi, nwa-oke-ehi ibu àjà-nmehie.
20 I gēwere kwa ufọdu n'ọbara-ya, tiyekwasi na mpi anọ ya, na n'elu nkuku anọ nke ngwe-ya, na n'ókè-ya buruburu: i we wepu nmehie-ya, kpuchie nmehie-ya.
21 I gēwere kwa oke-ehi nke àjà-nmehie ahu, ọ gēsure kwa ya n'ebe eleputara eleputa nke ulo a, n'èzí ebe nsọ a.
22 Ma n'ubochi nke-abua i gēweta nkpi nke zuru okè ibu àjà-nmehie; ha gēwepu kwa nmehie nke ebe-ichu-àjà, dika ha si were oke-ehi wepu nmehie-ya.
23 Mb͕e i wepusiri nmehie-ya, i gēweta nso nwa-oke-ehi nke zuru okè, na ebulu nke zuru okè site n'ìgwè ewu na aturu-gi.