47 Onye nēdina kwa n'ulo ahu gāsu uwe-ya nile; ọzọ, onye nēri ihe n'ulo ahu gāsu uwe-ya nile.
48 Ma ọ buru na onye-nchu-àjà abata nime, le anya, ma, le, ihe-otiti ahu abaghi aba n'ulo ahu, mb͕e etesiri ulo ahu; onye-nchu-àjà gāsi kwa na ulo ahu di ọcha, n'ihi na emewo ka ihe-otiti ahu la.
49 Ọ gēwere kwa nnunu abua, na osisi cedar, na ogho uhie, na hyssop, iwepu nmehie n'ulo ahu:
50 ọ gēb͕u kwa otù nime nnunu ahu n'ihe ájá n'elu miri nērù erù:
51 ọ gēwere kwa osisi cedar ahu, na hyssop ahu, na ogho uhie ahu, na nnunu ahu di ndu, sue ha nime ọbara nnunu ahu eb͕uru eb͕u na nime miri ahu nērù erù, fesa kwa ulo ahu ub͕ò asa:
52 Ọ gēwepu kwa nmehie n'ulo ahu site n'ọbara nnunu ahu, site kwa na miri ahu nērù erù, site kwa na nnunu ahu di ndu, site kwa n'osisi cedar ahu, site kwa na hyssop ahu, site kwa n'ogho uhie ahu:
53 ma ọ gēzilaga nnunu ahu di ndu n'azu obodo n'ọhia sara iru: ọ gēkpuchi-kwa-ra ulo ahu nmehie-ya: ọ gādi kwa ọcha.