13 Ma mb͕e emeworo onye nwere orùrù ka ọ di ọcha site n'orùrù-ya, ọ gāgu-kwa-ra onwe-ya ubọchi asa ime ka ọ di ọcha, ọ gāsu kwa uwe-ya nile: ọ gāsa kwa anu-aru-ya nime miri nērù erù, ọ gādi kwa ọcha.
14 Ma n'ubọchi nke-asatọ ọ gēwere n'onwe-ya nduru abua, ma-ọbu umu-kpalakwukwu abua, bia n'iru Jehova rue ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute, nye ha onye-nchu-àjà:
15 onye-nchu-àjà gēme kwa ha, otù ka ọ buru àjà-nmehie, ibe-ya ka ọ buru àjà-nsure-ọku; onye-nchu-àjà gēkpuchi-kwa-ra ya nmehie-ya n'iru Jehova n'ihi orùrù-ya.
16 Nwoke ọ bula, mb͕e ure-ya gēsi n'aru-ya pua, ọ gēwere kwa miri sa anu-aru-ya nile, ọ gāru kwa árú rue anyasi.
17 Uwe ọ bula, ma-ọbu akpukpọ ọ bula, nke ure dikwasi ya, agāsu ya na miri, ọ gāru kwa árú rue anyasi.
18 Nwayi kwa, onye nwoke nēdinayere, nke ọ rara aru n'aru-ya, ha abua gēwere miri sa aru-ha, ha gāru kwa árú rue anyasi.
19 Ọzọ, nwayi, mb͕e ọ nwere orùrù, ma orùrù-ya nke di n'anu-aru-ya bu ọbara ubọchi asa ka ọ gānọ n'idi-na-nsọ-ya: onye ọ bula nke nēmetu ya aru gāru kwa árú rue anyasi.