32 I gēbili ọtọ n'iru onye-isi-awọ, sọpuru kwa iru okenye, tu kwa egwu Chineke-gi: Mu onwem bu Jehova.
33 Mb͕e ọbìa gānoyere gi dika ọbìa n'ala-unu, unu emela ya ihe-ike.
34 Dika onye amuru n'ala site n'aru unu ka ọbìa gādiri unu, bú onye nọ dika ọbìa n'etiti unu, i gāhu kwa ya n'anya dika onwe-gi; n'ihi na ndi-ọbìa ka unu buri n'ala Ijipt: Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu.
35 Unu emela ajọ omume-n'ikpé, ma-ọbu n'itù ihe, ma-ọbu n'isi ihe, ma-ọbu n'itù ihe di miri miri.
36 Ihe-osìsì ziri ezi, na nkume isì-ihe ziri ezi na ephah ziri ezi, na hin ziri ezi, ka unu gēnwe: Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu, Nke mere ka unu si n'ala Ijipt puta.
37 Unu gēdebe kwa ukpurum nile na ikpém nile, me kwa ha: Mu onwem bu Jehova.