9 N'ihi na onye ọ bula nke nākọcha nna-ya ma-ọbu nne-ya, aghaghi ime ka ọ nwua: nna-ya ma-ọbu nne-ya ka ọ kọchaworo; ọbara-ya gādikwasi ya.
10 Nwoke nke ya na nwunye nwoke ọzọ nākwa iko, bú onye ya na nwunye madu-ibe-ya nākwa iko, aghaghi ime ka ha nwua, bú nwoke ahu nākwa iko, na nwayi ahu nākwa iko.
11 Nwoke ọ bula nke ya na nwunye nna-ya nēdina, ọtọ nna-ya ka o kpugheworo: aghaghi ime ka ha abua nwua; ọbara-ha gādikwasi ha.
12 Nwoke ọ bula nke ya na nwunye nwa-ya nēdina, aghaghi ime ka ha abua nwua: ngwakọta ọjọ ka ha meworo; ọbara-ha gādikwasi ha.
13 Nwoke ọ bula nke ya na nwoke nēdina, dika nwoke na nwayi nēdina, ihe-árú ka ha abua meworo: aghaghi ime ka ha nwua; ọbara-ha gādikwasi ha.
14 Nwoke ọ bula nke nēkuru nwayi na nne-ya, nzube ọjọ ka ọ bu: n'ọku ka agēsure ha, ya na ha; ka nzube ọjọ we ghara idi n'etiti unu.
15 Nwoke ọ bula nke ya na anumanu nēdina ka ọ ra aru n'aru-ya, aghaghi ime ka ọ nwua: unu gēb͕u kwa anumanu ahu.