8 Kwa-ubọchi-izu-ike o gēdo ya n'usoro n'iru Jehova mb͕e dum; o sitere n'umu Israel, ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi ka ọ bu.
9 Ọ gādiri Eron na umu-ya ndikom; ha gēri ya n'ebe di nsọ n'ihi na ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile ka ọ buru ya sitere n'àjà-ọku nile nke Jehova, ọ bu ukpuru ebighi-ebi.
10 Nwa-nwoke nke nwayi Israel, nwoke ahu bu kwa nwa nke nwoke Ijipt, we pua je n'etiti umu Israel: nwa-nwoke nke nwayi Israel ahu na otù onye Israel we lua ọ̀gù n'ọmuma-ulo-ikwū;
11 nwa-nwoke nke nwayi Israel ahu we kpọlu Aha ahu, kọcha kwa: ha we me ka ọ biakute Moses. Aha nne-ya bu Shelomit, nwa-nwayi Dibri, nke ebo Dan.
12 Ha we me ka ọ nọdu n'ebe anēdebe ndi-nkpọrọ, ka ewe kọrọ ha ala okwu ahu n'ọnu Jehova.
13 Jehova we gwa Moses, okwu, si,
14 Me onye ahu nākọcha akọcha ka ọ pua je n'azu ọmuma-ulo-ikwū; ndi nile nke nuru olu-ya gēbikwasi aka-ha n'isi-ya, nzukọ nile gātub͕u ya na nkume.