37 Ha gāsurita ngọngọ, otù n'aru ibe-ya, dika n'iru mma-agha, mb͕e onye nāchu ha adigh: ma nguzosi-ike n'iru ndi-iro-unu agaghi-adiri unu.
38 Unu gāla kwa n'iyì n'etiti mba nile ọzọ, ala ndi-iro-unu gēri kwa unu.
39 Ndi nāfọdu n'etiti unu gāta aru n'ajọ omume-ha n'ala nile nke ndi-iro-unu; ọzọ kwa, n'ajọ omume nile nke ndi bu nna-ha, ha gēso kwa ha ta aru.
40 Ha gēkwuputa ajọ omume-ha, na ajọ omume nke ndi bu nna-ha, nime nmekpu-ha nke ha mekpurum, ha gēkwuputa kwa na n'ihi na ha jeghariri n'imegidem,
41 Mu onwem we nējeghari kwa n'imegide ha, me ka ha ba n'ala ndi iro ha: ma ọ buru na obi-ha nke anēbighi úgwù eruru ala mb͕e ahu, ọ buru kwa na ahuhu ajọ omume-ha atọ ha utọ mb͕e ahu;
42 M'gēcheta kwa ọb͕ub͕a-ndu Mu na Jekob b͕ara; ọzọ kwa, ob͕ub͕a-ndu Mu na Aisak b͕ara, ọzọ kwa, ob͕ub͕a-ndu Mu na Abraham b͕ara, ka M'gēcheta; ala ahu ka M'gēcheta kwa.
43 Ha gārapu kwa ala ahu, ubọchi-izu-ike-ya nile gātọ kwa ya utọ, n'itọb͕ọ-n'efu ahu mb͕e ha nānọghi ya; ahuhu ajọ omume-ha gātọ kwa ha onwe-ha utọ: n'ihi na, ọbuná n'ihi na ikpém nile ka ha juru, ọ bu kwa ukpurum nile ka nkpuru-obi-ha sọrọ oyi.