18 Ma ọ buru na o do ala-ubi-ya nsọ mb͕e jubile gasiri, onye-nchu-àjà gāgu-kwa-ra ya ego-ya dika arọ fọduru iru arọ jubile si di, agāgubì kwa ihe n'ọ̀rùrù-ọnu-gi.
19 Ma ọ buru na onye ahu nke nēdo ala-ubi nsọ ab͕aputa ya n'ezie, ọ gātukwasi kwa ya otù uzọ n'uzọ ise nke ego ọ̀rùrù-ọnu-gi, agēme kwa ka o guzosiere ya ike.
20 Ma ọ buru na ọ b͕aputaghi ala-ubi ahu, ma-ọbu na ọ renyewo onye ọzọ ala-ubi ahu, agaghi-ab͕aputa ya ọzọ:
21 ma ala-ubi ahu, n'òpùpù-ya nime jubile, gādiri Jehova nsọ, dika ala-ubi nke ewezugara ka ebibie ya; onye-nchu-àjà gēnwe ihe-onwunwe ala-ubi ahu.
22 Ma ọ buru na o doro Jehova ala-ubi ọ zuworo nsọ, bú nke nēsiteghi n'ala-ubi nke ihe-onwunwe-ya;
23 onye-nchu-àjà gāgu-kwa-ra ya ọgugu nke ọ̀rùrù-ọnu-gi rue arọ jubile: ọ gēnye kwa ọ̀rùrù-ọnu-gi n'ubọchi ahu, dika ihe nsọ diri Jehova.
24 N'arọ jubile ala-ubi ahu gālaghachiri onye azutara ya n'aka-ya, bú onye nwe ihe-onwunwe nke ala ahu.