8 ọ gēbikwasi aka-ya n'isi onyinye-ya iji biaru nso, b͕u kwa ya n'iru ulo-ikwū nzute: umu-ndikom Eron gāwusa ọbara-ya n'ebe-ichu-àjà buruburu.
9 O gēsi kwa n'ihe àjà nke àjà-udo weta nso àjà-ọku ichuru Jehova: bú abuba-ya, na akuku ọdudu-ya nwere abuba n'izu-okè-ya, (n'ebe ọkpukpu-azu-ya di ka ọ gēwezuga ya); na abuba nke nēkpuchi ihe-ime, na abuba nile nke di n'elu ihe-ime,
10 na akọrọ abua, na abuba nke di n'elu ha, nke di n'akuku úkwù, na mba-imeju nke di n'imeju, (n'akuku akọrọ ka ọ gēwezuga ya).
11 Onye-nchu-àjà gēsure ya ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ n'ebe-ichu-àjà: ọ bu nri àjà-ọku anāchuru Jehova.
12 Ma ọ buru na onyinye-ya iji biaru nso bu ewu, ọ gēweta kwa ya nso n'iru Jehova.
13 O gēbikwasi aka-ya n'isi-ya, b͕u kwa ya n'iru ulo-ikwū nzute: umu-ndikom Eron gāwusa ọbara-ya n'ebe-ichu-àjà buruburu.
14 O gēsi kwa nime ya weta nso onyinye-ya iji biaru nso, bú àjà-ọku ichuru Jehova; abuba nke nēkpuchi ihe-ime, na abuba nile nke di n'elu ihe-ime,