Levitikọs 5:10-16 IGBOB

10 Ọ gēme nke-abua ka ọ buru àjà-nsure-ọku dika ikpé ahu si di: onye-nchu-àjà gēkpuchi-kwa-ra ya nmehie-ya ahu nke ọ mehieworo, agāb͕aghara kwa ya ya.

11 Ma ọ buru na aka-ya erughi na nduru abua ma-ọbu n'umu-kpalakwu-kwu abua, ọ gēweta kwa onyinye-ya iji biaru nso, bayere nmehie nke ọ mehie-woro, bú otù uzọ n'uzọ iri nke ephah utu ọka flour ka ọ buru àjà-nmehie; ọ gaghi-atukwasi ya manu, ọ gaghi-etiye kwa frankincense n'elu ya: n'ihi na àjà-nmehie ka ọ bu.

12 Ọ gēweta-kwa-ra ya onye-nchu-àjà, onye-nchu-àjà gēweju kwa nweju-aka-ya site na ya ibu ihe-ncheta-ya, o gēsure kwa ya ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'ebe-ichu-àjà, n'elu àjà-ọku nke Jehova: àjà-nmehie ka ọ bu.

13 Onye-nchu-àjà gēkpuchi-kwa-ra ya nmehie-ya ahu nke ọ mehieworo n'otù nime ihe ndia, agāb͕aghara kwa ya ya: ma nke fọduru gābu ihe onye-nchu-àjà nwere, dika onyinye-inata-iru-ọma ahu.

14 Jehova we gwa Moses okwu, si,

15 Mb͕e madu gēmekpu ihe-nmekpu, mehie n'amaghi-ama megide ihe nsọ nile nke Jehova; ọ gēweta-kwa-ra Jehova àjà-ikpe-ọmuma-ya, bú ebulu zuru okè si n'ìgwè ewu na aturu puta, dika ọ̀rùrù-ọnu-gi si di n'ọla-ọcha shekel, dika shekel nke ebe nsọ ahu si di, ka ọ buru àjà-ikpe-ọmuma:

16 ma ihe nke ọ mehieworo megide ihe nsọ ahu, ọ gākwughachi ya, ọ gātukwasi kwa otù uzọ n'uzọ ise n'elu ya, nye ya onye-nchu-àjà: onye-nchu-àjà gēwere ebulu àjà-ikpe-ọmuma kpuchiere ya nmehie-ya, agāb͕aghara kwa ya ya.