Levitikọs 5:7-13 IGBOB

7 Ma ọ buru na aka-ya erughi ihe gēzù nwa-aturu, o gēweta-kwa-ra Jehova àjà-ikpe-ọmuma-ya bayere nmehie nke ọ mehieworo, bú nduru abua ma-ọbu umu-kpalakwukwu abua; otù ka ọ buru àjà-nmehie, ibe-ya ka ọ buru àjà-nsure-ọku.

8 Ọ gāchitara ha onye-nchu-àjà, onye-nchu-àjà gēburu uzọ weta nso nke diri àjà-nmehie, ọ gātubipu isi-ya site n'olu-ya, ma ọ gaghi-ekewa ya.

9 Ọ gēfesa ufọdu nime ọbara àjà-nmehie ahu n'elu akuku ebe-ichu-àjà; ma nke fọduru nime ọbara ka agāgbasa na ntọ-ala ebe-ichu-aja: àjà-nmehie ka ọ bu.

10 Ọ gēme nke-abua ka ọ buru àjà-nsure-ọku dika ikpé ahu si di: onye-nchu-àjà gēkpuchi-kwa-ra ya nmehie-ya ahu nke ọ mehieworo, agāb͕aghara kwa ya ya.

11 Ma ọ buru na aka-ya erughi na nduru abua ma-ọbu n'umu-kpalakwu-kwu abua, ọ gēweta kwa onyinye-ya iji biaru nso, bayere nmehie nke ọ mehie-woro, bú otù uzọ n'uzọ iri nke ephah utu ọka flour ka ọ buru àjà-nmehie; ọ gaghi-atukwasi ya manu, ọ gaghi-etiye kwa frankincense n'elu ya: n'ihi na àjà-nmehie ka ọ bu.

12 Ọ gēweta-kwa-ra ya onye-nchu-àjà, onye-nchu-àjà gēweju kwa nweju-aka-ya site na ya ibu ihe-ncheta-ya, o gēsure kwa ya ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'ebe-ichu-àjà, n'elu àjà-ọku nke Jehova: àjà-nmehie ka ọ bu.

13 Onye-nchu-àjà gēkpuchi-kwa-ra ya nmehie-ya ahu nke ọ mehieworo n'otù nime ihe ndia, agāb͕aghara kwa ya ya: ma nke fọduru gābu ihe onye-nchu-àjà nwere, dika onyinye-inata-iru-ọma ahu.