1 Nka bu kwa iwu àjà-ikpe-ọmuma: ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile ka ọ bu.
2 N'ebe ha nēb͕u ihe àjà-nsure-ọku ka ha gēb͕u ihe àjà-ikpe-ọmuma; ọ gāwusa kwa ọbara-ya n'ebe-ichu-àjà buruburu.
3 Abuba-ya nile ka ọ gēsi nime ya weta nso; bú akuku ọdudu-ya nwere abuba, na abuba nke nēkpuchi ihe-ime,
4 na akọrọ abua, na abuba nke di n'elu ha, nke di n'akuku úkwù, na mba-imeju nke di n'imeju, (n'akuku akọrọ ka ọ gēwezuga ya):
5 onye-nchu-àjà gēsure ha ọku ibu ihe nsure-ọku nēsi ísì utọ n'ebe-ichu-àjà ka ọ buru àjà-ọku anāchuru Jehova: àjà-ikpe-ọmuma ka ọ bu.
6 Nwoke ọ bula n'etiti ndi-nchu-àjà gēri ya: n'ebe di nsọ ka agēri ya: ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile ka ọ bu.