19 Anu nke meturu ihe ọ bula ruru árú, agaghi-eri ya: agēji ọku sure ya. Ma anu àjà ahu, onye ọ bula nke di ọcha gēri anu-ya:
20 ma madu nke nēri anu sitere n'ihe àjà nke-udo, nke Jehova nwere, ma ọrurú-ya di n'aru ya, agēbipu madu ahu n'etiti umu-nna-ya.
21 Ma mb͕e madu gēmetu ihe ọ bula ruru árú aru, bú ọrurú madu, ma-ọbu anumanu ruru árú, maọbu ihe-árú ọ bula ruru árú, we rie ufọdu nime anu ihe àjà-udo, nke Jehova nwere, agēbipu madu ahu n'etiti umu-nna-ya.
22 Jehova we gwa Moses okwu, si,
23 Gwa umu Israel okwu, si, Unu erila abuba ọ bula, nke ehi, ma-ọbu aturu, ma-ọbu ewu.
24 Abuba nke anumanu nwuru onwe-ya, na abuba nke anumanu anu-ọhia dọb͕uru, agēdozi ya iji je ozi ọ bula: ma unu erila ya ma-ọli.
25 N'ihi na onye ọ bula nke nēri abuba sitere n'anumanu nke madu si nime ya eweta nso àjà-ọku ichuru Jehova, agēbipu kwa madu nke nēri ya n'etiti umu-nna-ya.