4 na akọrọ abua, na abuba nke di n'elu ha, nke di n'akuku úkwù, na mba-imeju nke di n'imeju, (n'akuku akọrọ ka ọ gēwezuga ya):
5 onye-nchu-àjà gēsure ha ọku ibu ihe nsure-ọku nēsi ísì utọ n'ebe-ichu-àjà ka ọ buru àjà-ọku anāchuru Jehova: àjà-ikpe-ọmuma ka ọ bu.
6 Nwoke ọ bula n'etiti ndi-nchu-àjà gēri ya: n'ebe di nsọ ka agēri ya: ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile ka ọ bu.
7 Dika àjà-nmehie si di, otú a ka àjà-ikpe-ọmuma di: otù iwu diri ha: onye-nchu-àjà nke nēwere ya ikpuchi nmehie, ya onwe-ya gēnwe ya.
8 Onye-nchu-àjà nke nēweta nso àjà-nsure-ọku nke onye ọ bula, onye-nchu-àjà onwe-ya gēnwe akpukpọ nke ihe àjà-nsure-ọku nke o wetaworo nso n'onwe-ya.
9 Ọzọ, onyinye-inata-iru-ọma ọ bula nke anēsi n'ite-ọku, na ihe ọ bula anēme n'ihe ighe ihe, na n'ite isi ihe, onye-nchu-àjà nke nēweta ya nso, ya onwe-ya gēnwe ya.
10 Ọzọ onyinye-inata-iru-ọma ọ bula, agwara manu, ma-ọbu nke kpọrọ akpọ, umu-ndikom Eron nile gēnwe ya, otù dika ibe-ya.