11 O rue n'arọ nke-abua, n'ọnwa nke-abua, n'ubọchi nke-orú n'ọnwa ahu, na igwe-oji ahu siri n'elu ebe-obibi nke ihe-àmà ahu rigo.
12 Umu Israel we si n'ọzara Sainai bulie ije dika nbuli-ije nile ha si di; igwe-oji ahu we nọdu n'ọzara Peran.
13 Ma ha buru uzọ bulie ije n'okwu-ọnu Jehova n'aka Moses.
14 Ọkọlọtọ nke ọmuma-ulo-ikwū umu Juda buru uzọ bulie ije, dika usu nile nke ndi-agha-ha si di: Nahshon nwa Aminadab nọ n'isi usu-ndi-agha-ya.
15 Onye nọ n'isi usu-ndi-agha nke ebo umu Isaka bu Netanel nwa Zua.
16 Onye nọ n'isi usu-ndi-agha nke ebo umu Zebulun bu Eliab nwa Hilon.
17 Ewe weda ebe-obibi ahu; umu Giashon na umu Merari, ndi nēbu ebe-obibi ahu, we bulie ije.