26 Onye nọ n'isi usu-ndi-agha nke ebo umu Asha bu Pagiel nwa Ọkran.
27 Onye nọ n'isi usu-ndi-agha nke ebo umu Naftali bu Ahira nwa Inan.
28 Ndia bu nbuli-ije nke umu Israel, dika usu nile nke ndi-agha-ha si di; ha we bulie ije.
29 Moses we si Hobab, nwa Reuel onye Midian, bú nna nwunye Moses, Ndi nēbuli ije ka ayi bu rue ebe ahu nke Jehova kwuru okwu bayere ya, si, Nke ahu ka M'gēnye unu: soro ayi je, ayi gēme kwa gi nma: n'ihi na Jehova ekwuwo ezi ihe bayere Israel.
30 Ọ we si ya, M'gaghi-eje; kama alam na umu-nnam ka m'gālakuru.
31 Ọ we si, Biko, arapula ayi; n'ihi na i mara ọmuma-ulo-ikwū-ayi n'ọzara, i gābu-kwa-ra ayi anya.
32 O gēru kwa, mb͕e i soro ayi je, o gēru kwa, na ezi ihe ahu nke Jehova gēme ayi nma ya, ayi gēme kwa gi nma.