3 Mb͕e ha gēwere ha fùa, nzukọ Israel nile gēzukọ n'ebe i nọ rue ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute.
4 Ma ọ buru na otù ka ha were fùa, ndi-isi, bú ndi-isi nke usu nile nke nnù ndikom abua na ọgu iri nke Israel, gēzukọ kwa n'ebe i nọ.
5 Mb͕e unu gāfù opì ka ọ we dasie uda ike, ọmuma-ulo-ikwū nile nke nāma ulo-ikwū-ha n'akuku Iru-anyanwu gēbuli kwa ije.
6 Mb͕e unu gāfù opì ub͕ò nke-abua ka ọ we dasie uda ike, ọmuma-ulo-ikwū nile nke nāma ulo-ikwū-ha n'akuku Ndida gēbuli kwa ije: ha gāfù opì ka ọ we dasie uda ike bayere nbuli-ije nile ha.
7 Ma n'ikpọkọta nkpọkọta Israel unu gāfù opì, ma unu emela ka ọ dasie uda ike.
8 Ọ bu umu-ndikom Eron, bú ndi-nchu-àjà, gēwere opì abua ahu fua; ha gābu-kwa-ra unu ukpuru ebighi-ebi rue ọb͕ọ nile unu.
9 Ọzọ, mb͕e unu nēbu agha n'ala-unu megide onye-nkpab͕u nākpab͕u unu, unu gēwere opì me ka ha dasie uda ike; agēcheta kwa unu n'iru Jehova, bú Chineke-unu, agāzọputa kwa unu n'aka ndi-iro-unu.