23 Jehova we si Moses, Aka Jehova, ọ̀ ghọwo nkpunkpu aka? ub͕u a ka i gāhu ma okwum gērere gi ma-ọbu na ọ gaghi-ere.
24 Moses we pua, gwa ndi Israel okwu nile nke Jehova: o we chikọta ọgu ndikom atọ na iri sitere na ndi-okenye nke ndi Israel, guzo ha buruburu Ulo-ikwū ahu.
25 Jehova we ridata n'igwe-oji ahu, gwa ya okwu, nara ufọdu nime Mọ ahu nke dikwasiri ya, tiyekwasi n'ọgu ndi-okenye atọ na iri ahu: o rue, mb͕e Mọ ahu bekwasiri ha, na ha buru amuma, ma ha emeghi ya ọzọ.
26 Ma ndikom abua fọduru n'ọmuma-ulo-ikwū, aha nke otù onye nime ha bu Eldad, aha nke ibe-ya bu Midad: Mọ ahu we bekwasi ha; ha onwe-ha di kwa n'etiti ndi edere aha-ha n'akwukwọ, ma ha apughi jerue Ulo-ikwū ahu: ha we bū amuma n'ọmuma-ulo-ikwū.
27 Otù okorọbia we b͕a ọsọ, gosi Moses, si, Eldad na Midad nēbu amuma n'ọmuma-ulo-ikwū.
28 Joshua nwa Nun, onye nējere Moses ozi, bú otù onye nime ndikom-ya arọputaworo, we za, si, Onye-nwem Moses, b͕ochie ha.
29 Moses we si ya, Ọ̀ bu onye nēkwo ekworo ka i burum? ọ gādim nọ̄ nma ma asi na ndi Jehova nile bu ndi-amuma ka Jehova we tiyekwasi ha Mọ-Ya!