27 Otù okorọbia we b͕a ọsọ, gosi Moses, si, Eldad na Midad nēbu amuma n'ọmuma-ulo-ikwū.
28 Joshua nwa Nun, onye nējere Moses ozi, bú otù onye nime ndikom-ya arọputaworo, we za, si, Onye-nwem Moses, b͕ochie ha.
29 Moses we si ya, Ọ̀ bu onye nēkwo ekworo ka i burum? ọ gādim nọ̄ nma ma asi na ndi Jehova nile bu ndi-amuma ka Jehova we tiyekwasi ha Mọ-Ya!
30 Moses, ya na ndi-okenye Israel, we chikọta onwe-ha n'ọmuma-ulo-ikwū.
31 Otù ifufe we si n'ebe Jehova nọ bulie ije, we keputa nnunu quail n'oké osimiri, rapu ha n'akuku ọmuma-ulo-ikwū, dika ije otù ubọchi n'otù akuku, na dika ije otù ubọchi n'akuku. nke-ọzọ, buruburu ọmuma-ulo-ikwū, na dika cubit abua n'elu iru ala.
32 Ndi Israel we bilie ubọchi ahu nile, na abali-ya nile, na echi-ya nile, chikọta nnunu quail ahu: onye nāchikọta ntà chikọtara homer iri: ha we were ha b͕asara onwe-ha n'ebe nile buruburu-ọmuma-ulo-ikwū
33 Mb͕e anu ahu nādi n'etiti ezé-ha ub͕u a, tutu atabie ya, iwe Jehova we di ọku megide ndi Israel, Jehova we were ihe-otiti riri nne nke-uku tie ndi Israel.