4 Ìgwè ndi gwara ọgwa nke nọ n'etiti ha we chọ ajọ ọchichọ: umu Israel we kwa kwa ákwá ọzọ, si, Ònye gēme ka ayi rie anu?
5 Ayi nēcheta azù nke ayi nēri n'Ijipt nāzughi azú; ya na cucumbers na melons, na leeks, na onions, na garlic:
6 ma ub͕u a nkpuru-obi ayi akpọwo nku, ọ dighi ihe ọ bula ayi nwere: ọ bu nání manna nka di n'iru ayi.
7 Ma manna ahu, dika nkpuru coriander ka ọ bu, iru-ya di kwa ka iru bdellium.
8 Ndi Israel jeghariri, chikọta ya, were nkume-igwe-nri gwe ya, ma-ọbu na ha suru ya n'ikwè, we sie ya n'ite, me ya ka ọ buru ob͕e achicha: idetu ya ire ọ di ka idetu ihe eji manu si esi.
9 Mb͕e igirigi dakwasiri ọmuma-ulo-ikwū ahu n'abali, manna we dakwasi ya.
10 Moses we nu ndi Israel ka ha nākwa ákwá n'ab͕uru nile ha, nwoke ọ bula n'ọnu-uzọ ulo-ikwū-ya: iwe nke Jehova we di ọku nke-uku; ọ jọ-kwa-ra njọ n'anya Moses.