2 Ha we si, Ọ̀ bu ezie na nání Moses ka Jehova wereworo kwue okwu? Ọ̀ bughi kwa ayi ka o wereworo kwue okwu? Jehova we nu ya.
3 Ma nwoke ahu, bú Moses, di ume-ala n'obi nke-uku, kari madu nile ndi nọ n'elu ala.
4 Jehova we si Moses na Eron na Miriam na mberede, Putanu, unu atọ, rue ulo-ikwū nzute. Ha atọ we puta.
5 Jehova we ridata n'ogidi igwe-oji, guzo n'ọnu-uzọ Ulo-ikwū, kpọ Eron na Miriam: ha abua we puta.
6 Ọ we si Biko, nurunu okwum nile: ọ buru na onye-amuma di n'etiti unù, n'ọhu ka Mu, bú Jehova, gēme ka ọ maram, na nrọ ka M'gāgwa ya okwu.
7 Ọ bughi otú a ka orùm Moses di; n'ulom nile onye kwesiri ntukwasi-obi ka ọ bu
8 ọnu na ọnu ka M'gāgwa ya okwu ọbuná n'ile-anya, ọ bughi kwa n'ilu di iche iche; udi Jehova ka ọ gēlegide kwa anya: ọ̀ bu kwa gini mere unu nātughi egwu ikwu okwu megide orùm, bú imegide Moses?