26 Jehova we gwa Moses na Eron okwu, si,
27 Rùe ole mb͕e ka M'gānagide nzukọ ọjọ nka nke nātamu ntamu megidem? ntamu nile nke umu Israel, nke ha onwe-ha nātamu megidem, ka M'nuworo.
28 Si ha, Mu onwem nādi ndu, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta, dika unu kwuworo na ntim, otú a ka M'nāghaghi ime unu:
29 n'ọzara nka ka ozu-unu ga-ada; ndi-unu nile agukọtara agukọta, dika ọnu-ogugu nile unu si di, site n'onye b͕ara orú arọ we gaba n'iru, ndi tamuworo ntamu megidem,
30 unu onwe-unu agaghi-abà n'ala ahu ma-ọli, nke M'buliri akam ime ka unu biri nime ya, ma-ọbughi Keleb nwa Jefune na Joshua nwa Nun.
31 Ma umu-ntakiri-unu, ndi unu siri na ha gāghọ ihe-nluta-n'agha, M'gēme kwa ka ha ba, ha gāma kwa ala ahu nke unu juru aju.
32 Ma unu onwe-unu, ozu-unu gāda n'ọzara nka.