20 Jehova we si Eron, I gaghi-eketa ihe n'ala-ha, ọ dighi kwa òkè i gēnwe n'etiti ha: Mu onwem bu òkè-gi na ihe-nketa-gi n'etti umu Israel.
21 Ma umu Livai, le, ha ka M'nyeworo otù uzọ n'uzọ iri nke ihe nile n'Israel, ibu ihe-nketa, dika ihe-nkwughachi òfùfè-ha, nke ha onwe-ha nēfè, bú òfùfè nke ulo-ikwū nzute.
22 Ma umu Israel agaghi-abiaru nso ulo-ikwū nzute ahu ọzọ ibū nmehie, inwu anwu.
23 Ma ndi Livai gēfè òfùfè ahu nke ulo-ikwū nzute, ha onwe-ha gēbu kwa ajọ omume-ha: ukpuru ebighi-ebi ka ọ bu rue ọb͕ọ nile unu, ma n'etiti umu Israel ha agaghi-eketa ihe-nketa.
24 N'ihi na ọ bu otù uzọ n'uzọ iri nke ihe umu Israel, nke ha nēbuliri Jehova dika àjà-nbuli, ka M'nyeworo ndi Livai, ibu ihe-nketa: ya mere M'siworo ha, N'etiti umu Israel ha agaghi-eketa ihe-nketa.
25 Jehova we gwa Moses okwu, si,
26 I gāgwa kwa ndi Livai okwu, si ha, Mb͕e unu nānara n'aka umu Israel otù uzọ n'uzọ iri nke M'nyeworo unu site n'aka-ha, dika ihe-nketa-unu, unu gēsi kwa na ya bulie àjà-nbuli nke Jehova, bú otù uzọ n'uzọ iri nke si n'otù uzọ n'uzọ iri ahu puta.