5 Moses we si ndi-ikpé Israel, B͕uenu, onye ọ bula ya b͕ue ndikom-ya ndi nēkekọta onwe-ha n'aru Beal-peoa.
6 Ma, le, otù nwoke nime umu Israel biara, weta nso umu-nne-ya otù nwayi Midian n'anya Moses, na n'anya nzukọ nile nke umu Israel, mb͕e ha onwe ha nākwa ákwá n'ọnu-uzọ ulo-kwū nzute.
7 Finehas, nwa-nwoke Eleeza, nwa Eron, bú onye-nchu-àjà, we hu ya, o we si n'etiti nzukọ Israel bilie, were ube n'aka-ya,
8 soro nwoke Israel ahu ba nime ulo-ndina-ya, mapue ha abua, bú nwoke Israel ahu, na nwayi ahu rue ime-afọ-ya. Ewe b͕ochie ihe otiti ahu n'aru umu Israel.
9 Ma ndi nwuru n'ihe-otiti ahu di orú nnù uzọ atọ.
10 Jehova we gwa Moses okwu, si,
11 Finehas, nwa Eleeza, nwa Eron, bú onye-nchu-àjà, emewo ka ọnumam si n'aru umu Israel laghachi, n'iwere ekworom kwo ekworo n'etiti ha, M'we ghara ime ka umu Israel gwusia n'ekworom.