7 Finehas, nwa-nwoke Eleeza, nwa Eron, bú onye-nchu-àjà, we hu ya, o we si n'etiti nzukọ Israel bilie, were ube n'aka-ya,
8 soro nwoke Israel ahu ba nime ulo-ndina-ya, mapue ha abua, bú nwoke Israel ahu, na nwayi ahu rue ime-afọ-ya. Ewe b͕ochie ihe otiti ahu n'aru umu Israel.
9 Ma ndi nwuru n'ihe-otiti ahu di orú nnù uzọ atọ.
10 Jehova we gwa Moses okwu, si,
11 Finehas, nwa Eleeza, nwa Eron, bú onye-nchu-àjà, emewo ka ọnumam si n'aru umu Israel laghachi, n'iwere ekworom kwo ekworo n'etiti ha, M'we ghara ime ka umu Israel gwusia n'ekworom.
12 N'ihi ya si ya, Le, anamenye ya ọb͕ub͕a-ndum nke udo:
13 ọ gāburu ya, buru kwa nkpuru-ya gānọchi ya, ọb͕ub͕a-ndu ọlu-nchu-àjà ebighi-ebi; n'ihi na o kworo ekworo bayere Chineke-ya, kpuchi-kwa-ra umu Israel nmehie-ha.