14 Ndia bu ab͕uru ndi Simeon, orú nnù uzọ abua, na nnù iri-na-ise, na ọgu iri.
15 Umu-ndikom Gad, dika ab͕uru nile ha si di: nke Zefon bu ab͕uru ndi Zefon: nke Hagi bu ab͕uru ndi Hagi: nke Shuni bu ab͕uru ndi Shuni:
16 nke Ọzni bu ab͕uru ndi Ọzni: nke Iri bu ab͕uru ndi Iri:
17 nke Arod bu ab͕uru ndi Arod: nke Areli bu ab͕uru ndi Areli.
18 Ndia bu ab͕uru umu-ndikom Gad, dika ndi-ha agukọtara agukọta si di, orú nnù uzọ ise, na nnu, na ọgu ise.
19 Umu-ndikom Juda, Ia na Onan: ma Ia na Onan nwuru n'ala Kenean.
20 Umu-ndikom Juda, dika ab͕uru nile ha si di, bu; nke Shila bu ab͕uru ndi Shila: nke Perez bu ab͕uru ndi Perez: nke Zera bu ab͕uru ndi Zera.