51 Ndia bu ndi agukọtara agukọta nke umu Israel, orú nnù ogu uzọ atọ na uzọ iri-na-ise, na nnù anọ, na ọgu isi, na iri.
52 Jehova we gwa Moses okwu, si,
53 Ndia ka agēkere ala ahu n'ihe-nketa, n'ọnu-ọgugu aha.
54 Ndi bara uba ka i gēme ka ala-nketa-ha rie nne, ma ndi di ole-na-ole ka i gēme ka ala-nketa-ha di ntà; agēnye nwoke ọ bula ala-nketa-ya, dika ndi-ya agukọtara agukọta si di.
55 Nání ọ bu n'ife-nzà ka agēkè ala ahu: dika aha nile nke ebo nile nke ndi bu nna-ha si di ka ha gēketa.
56 Dika ife-nzà si di ka agēkè ihe-nketa-ha n'etiti ndi bara uba na ndi di ole-na-ole.
57 Ndia bu ndi agukọtara agukọta nke ndi Livai dika ab͕uru nile ha si di: nke Giashon bu ab͕uru ndi Giashon: nke Kohat bu ab͕uru ndi Kohat: nke Merari bu ab͕uru ndi Merari.