13 unu gēweta kwa nso àjà-nsure-ọku, bú àjà-ọku nke ihe ísì utọ anāchuru Jehova; umu-oke-ehi iri na atọ, ebulu abua, umu-aturu iri na anọ nke b͕ara otù arọ; nke zuru okè ka ha gābu:
14 na onyinye-inata-iru-ọma-ha, utu ọka flour agwara manu, uzọ atọ n'uzọ iri iji chu oke-ehi ọ bula nime oke-ehi iri na atọ ahu, uzọ abua n'uzọ iri iji chu ebulu ọ bula nime ebulu abua ahu,
15 otù uzọ iri, otù uzọ n'uzọ iri, iji chu nwa-aturu ọ bula nime umu-aturu iri na anọ ahu:
16 na otù nkpi iji chu àjà-nmehie; nāgughi àjà-nsure-ọku anēsure mb͕e dum, na onyinye-inata-iru-ọma-ya, na àjà-ihe-ọṅuṅu-ya.
17 N'ubọchi nke-abua unu gēweta kwa nso umu-oke-ehi iri na abua, ebulu abua, umu-aturu iri na anọ nke b͕ara otù arọ, nke zuru okè:
18 na onyinye-inata-iru-ọma-ha, na àjà-ihe-ọṅuṅu nile ha, iji chu oke-ehi iri na abua ahu, na iji chu ebulu abua ahu, na iji chu umu aturu ahu, n'ọnu-ọgugu-ha, dika ikpé ahu si di:
19 na otù nkpi iji chu àjà-nmehie; nāgughi àjà-nsure-ọku anēsure mb͕e dum, na onyinye-inata-iru-ọma-ya, na àjà-ihe-ọṅuṅu nile ha.