5 Ewe si n'usu nnù abua na ọgu iri nile nke Israel rara nnù ndikom abua na ọgu iri nke ebo ọ bula nye, orú nnù na nnù iri ejikere iso usu-ndi-agha ahu.
6 Moses we ziga ha, nnù ndikom abua na ọgu iri nke ebo ọ bula, isoro usu-ndi-agha, ha na Finehas nwa Eleeza, bú onye-nchu-àjà, isoro usu-ndi-agha, ihe nile nke ebe nsọ Chineke na opì abua ọ gāfù idasi uda ike di kwa n'aka-ya.
7 Ha we buso Midian agha, dika Jehova nyere Moses iwu; ha we b͕ue nwoke nile ọ bula.
8 Ndi-eze Midian ka ha b͕u-kwa-ra, tiyere ndi-ha eb͕uru eb͕u; bú Evi, na Rekem, na Zua, na Hua, na Reba, eze ise Midian: ha were kwa mma-agha b͕ue Belam nwa Beoa.
9 Umu Israel we dọta ndinyom Midian na umu-ntakiri-ha n'agha; ọ bu kwa anu-ulo-ha nile, na anumanu-ha nile, na àkù-ha nile, ka ha lutara n'agha.
10 Ha sure-kwa-ra obodo-ha nile n'ebe-obibi nile ha, na ebe-ulo-ikwū-ha nile, n'ọku.
11 Ha we chiri ihe nile akwatara n'agha, na ihe-nweta nile, ma n'etiti madu ma n'etiti anumanu.