8 Ndi-eze Midian ka ha b͕u-kwa-ra, tiyere ndi-ha eb͕uru eb͕u; bú Evi, na Rekem, na Zua, na Hua, na Reba, eze ise Midian: ha were kwa mma-agha b͕ue Belam nwa Beoa.
9 Umu Israel we dọta ndinyom Midian na umu-ntakiri-ha n'agha; ọ bu kwa anu-ulo-ha nile, na anumanu-ha nile, na àkù-ha nile, ka ha lutara n'agha.
10 Ha sure-kwa-ra obodo-ha nile n'ebe-obibi nile ha, na ebe-ulo-ikwū-ha nile, n'ọku.
11 Ha we chiri ihe nile akwatara n'agha, na ihe-nweta nile, ma n'etiti madu ma n'etiti anumanu.
12 Ha we wetara Moses, weta-kwa-ra Eleeza, bú onye-nchu-àjà, weta-kwa-ra nzukọ umu Israel, ndi adọtara n'agha, na ihe-nweta, na ihe akwatara n'agha, rue ọmuma-ulo-ikwū, rue ala ihe nādighi nke Moab nke di n'akuku Jọdan na nso Jeriko.
13 Moses, na Eleeza, bú onye-nchu-àjà, na ndi-isi nile nke nzukọ Israel, we pua izute ha n'azu ọmuma-ulo-ikwū.
14 Moses we wesa ndi-nlekọta usu-ndi-agha ahu iwe, bú ndi-isi usu nile nke nnù ndikom abua na ọgu iri na ndi-isi usu nile nke ọgu ndikom ise, ndi nēsi n'usu-ndi-agha nke agha ahu bia.