16 Ha we biakute ya nso, si, Ogige ìgwé ewu na aturu ka ayi gēwuru anu-ulo-ayi n'ebe a, wu-kwa-ra umu-ntakiri-ayi obodo:
17 ma ayi onwe-ayi gējikere onwe-ayi je ọsọsọ n'iru umu Israel, rue mb͕e ayi gēme ka ha ba n'ebe-ha: ma umu-ntakiri-ayi gēbi n'obodo ndia ewusiri ike n'ihi ndi bi n'ala ahu.
18 Ayi agaghi-alata n'ulo-ayi, rue mb͕e umu Israel ketaworo, nwoke ọ bula ihe-nketa-ya.
19 N'ihi na ayi agaghi-esoro ha keta si n'ofè Jọdan we gaba n'iru, n'ihi na ihe-nketa-ayi abiaruwo ayi aka n'ofè Jọdan nka n'uzọ ọwuwa-anyanwu.
20 Moses we si ha, Ọ buru na unu eme ihe a; ọ buru na unu ejikere onwe-unu n'iru Jehova ibu agha,
21 ọ buru kwa na onye ọ bula nime unu nke ejikere agabiga Jọdan n'iru Jehova, rue mb͕e Ọ gānapu ndi-iro-Ya ala-ha n'iru Ya,
22 ewe buda ala ahu n'iru Jehova: emesi kwa unu gālata, we buru ndi ikpe nāmaghi site n'aka Jehova, site kwa n'aka Israel; ala nka ewe buru unu ihe-onwunwe n'iru Jehova.