31 Umu Gad umu Reuben we za, si, Okwu nke Jehova gwaworo ndi-orù-gi, otù a ka ayi gēme
32 Ayi onwe-ayi gāgabiga na njikere n'iru Jehova ba n'ala Kenean, ọ bu kwa n'aka-ayi ka ihe-onwunwe nke ihe-nketa-ayi gādi n'ofè Jọdan.
33 Moses we nye ha, bú umu Gad, na umu Reuben, na nkera ebo Manase nwa Josef, ala-eze Saihon, bú eze ndi-Amorait, na ala-eze Og, bú eze Beshan, ala ahu, dika obodo-ya nile si di n'ókè-ala nile ha, bú obodo nile nke ala ahu buruburu.
34 Umu Gad we wue Dibon, na Atarot, na Aroea;
35 na Atrot-shofan, na Jeza, na Jọgbeha;
36 na Bet-nimra, na Bet-haran: bú obodo ewusiri ike, na ogige ìgwè ewu na aturu.
37 Umu Reuben wu-kwa-ra Heshbon na Eleale, na Kiriataim;