34 Umu Gad we wue Dibon, na Atarot, na Aroea;
35 na Atrot-shofan, na Jeza, na Jọgbeha;
36 na Bet-nimra, na Bet-haran: bú obodo ewusiri ike, na ogige ìgwè ewu na aturu.
37 Umu Reuben wu-kwa-ra Heshbon na Eleale, na Kiriataim;
38 na Nebo, na Beal-meon, (ma ab͕anwere aha-ha,) na Sibma: ha we were aha kpọkwasi obodo ha wuru aha.
39 Umu Makia nwa Manase we je Gilead, were ya, napu ya n'aka ndi-Amorait ndi bi nime ya.
40 Moses we were Gilead nye Makia nwa Manase; ọ we biri nime ya.