26 Ma ọ buru na ob͕u-madu ahu esi n'ókè-ala obodo nb͕abà ya pua ma-ọli, bú ebe ọ b͕alagara;
27 onye-ọ́bọ̀ ọbara ewe huta ya n'azu ókè-ala abodo nb͕abà ya, onye-ọ́bọ̀ ọbara ahu we b͕ue ob͕u-madu ahu, ọ dighi ikpe ọbara mara ya:
28 n'ihi na nime obodo nb͕abà ya ka o gēbi rue mb͕e ọnwu onye-isi-nchu-àjà: ma mb͕e ọnwu onye-isi-nchu-àjà gasiri ob͕u-madu ahu gālaghachi n'ala ihe-onwunwe-ya.
29 Ihe ndia gābu-kwa-ra unu ukpuru ikpé rue ọb͕ọ nile unu n'ebe-obibi-unu nile.
30 Onye ọ bula nke nētib͕u madu, n'ọnu ndi-àmà ka agēb͕u ob͕u-madu ahu: ma nání otù onye-àmà agaghi-ab͕agide madu àmà ka ọ nwua.
31 Unu anara-kwa-la ihe-nb͕aputa n'ọnọdu ndu ob͕u-madu, nke ikpe inwu ọnwu maworo: ma aghaghi ime ka ọ nwua.
32 Unu anara-kwa-la ihe nb͕aputa n'ọnọdu onye b͕alagaworo n'obodo nb͕abà ya, ka ọ we lata ibi n'ala-ya, rue mb͕e ọnwu onye-nchu-àjà.