46 Ndi nile agukọtara agukọta nke ndi Livai, ndi Moses na Eron na ndi-isi Israel gukọtara, dika ab͕uru nile ha si di, na dika ulo nke ndi bu nna-ha si di,
47 site n'onye b͕ara orú arọ na iri we gaba n'iru we rue onye b͕ara ọgu arọ abua na iri, onye ọ bula nke nābà ifè òfùfè, na òfùfè nke ibu n'ulo-ikwū nzute,
48 ọbuná ndi-ha agukọtara agukọta, di orú nnù na otù nnù na ọgu iteghete.
49 N'okwu-ọnu Jehova ka agukọtara ha n'aka Moses, nwoke ọ bula dika ibu-ya si di: bú ndi-ya agukọtara agukọta, dika Jehova nyere Moses iwu.