20 Moses, na Eron, na nzukọ nile nke umu Israel, we me ndi Livai otú a: dika ihe nile si di nke Jehova nyere Moses n'iwu bayere ndi Livai, otú a ka umu Israel mere ha.
21 Ndi Livai we wepu nmehie n'onwe-ha, su uwe-ha; Eron we fé ha ka ha buru àjà-ofufé n'iru Jehova; Eron we kpuchiere ha nmehie-ha ime ka ha di ọcha.
22 Emesia ndi Livai we ba ifè òfùfè-ha n'ulo-ikwū nzute n'iru Eron, na n'iru umu-ya ndikom: dika Jehova nyere Moses iwu bayere ndi Livai, otú a ka ha mere ha.
23 Jehova we gwa Moses okwu, si
24 Nka bu nke ndi Livai nwere: site n'onye b͕ara orú arọ na ise we gaba n'iru ha gābà ibu agha n'òfùfè nke ulo-ikwū nzute:
25 ma site n'onye b͕ara ọgu arọ abua na iri we gaba n'iru ha gēsi n'ibu-agha nke òfùfè ahu laghachi, ha agaghi-efè ọzọ;
26 ma ha gēso umu-nne-ha je ozi n'ulo-ikwū nzute, idebe ihe-ndebe, ma ọ dighi òfùfè ha gēfè. Otú a ka i gēme ndi Livai n'ihe-ndebe-ha.