3 N'ubọchi nke-iri-na-anọ n'onwa nka, n'etiti ehihie na anyasi, ka unu gēme ya na mb͕e-ya akara àkà: dika ukpuru-ya nile si di, na dika ikpé-ya nile si di, ka unu gēme ya.
4 Moses we gwa umu Israel okwu, si ha me ememe ngabiga ahu.
5 Ha we me ememe ngabiga ahu n'ọnwa mbu, n'ubọchi nke-iri-na-anọ nke ọnwa ahu, n'etiti ehihie na anyasi, n'ọzara Sainai: dika ihe nile si di nke Jehova nyere Moses n'iwu, otú a ka umu Israel mere.
6 Ma ndikom ufọdu di, ndi bu ndi ruru árú site n'ozu madu, ha apughi kwa ime ememe ngabiga ahu n'ubọchi ahu: ha we biaru nso n'iru Moses na n'iru Eron n'ubọchi ahu:
7 ndikom ahu we si ya, Ayi onwe-ayi bu ndi ruru árú site n'ozu madu: n'ihi gini ka anēb͕ochi ayi ka ayi we ghara iweta nso onyinye iji biaru nso Jehova na mb͕e-ya akara àkà n'etiti umu Israel?
8 Moses we si ha, Guzonu; ka m'we nu ihe Jehova gēnye n'iwu bayere unu.
9 Jehova we gwa Moses okwu, si,