7 o chiri kwa nnù ub͕ọ-ala na ọgu iri arọputaworo, na ub͕ọ-ala nile nke Ijipt, na ndi-isi-agha n'elu ha nile.
8 Jehova we me ka obi Fero, bú eze Ijipt, di ike, ọ we chu umu Israel n'azu: umu Israel nēwere kwa aka di elu pua.
9 Ndi Ijipt we nāchu ha n'azu, bú inyinya nile nke ub͕ọ-ala nile nke Fero, na ndi-inyinya-ya, na usu-ndi-agha-ya, we rue ha aru ka ha nāma ulo-ikwū-ha n'akuku oké osimiri, n'akuku Pai-hahairot, n'iru Beal-zefon.
10 Fero we biarue nso, umu Israel we welie anya-ha, ma, le, ndi Ijipt nebuli ije n'azu ha; ha we tua egwu nke-uku: umu Israel we tikue Jehova.
11 Ha si Moses, Ọ̀ bu n'ihi na ílì adighi n'Ijipt na i chipuwo ayi inwu n'ọzara? gini bu nka i meworo ayi, n'ime ka ayi si n'Ijipt puta?
12 Ọ̀ bughi nka bu okwu nke ayi gwara gi n'Ijipt, si, Rapu ayi, ka ayi we fè ndi Ijipt? N'ihi na ọ di ayi nma ifè ndi Ijipt, kari inwu n'ọzara.
13 Moses we si ndi Israel, Unu atula egwu, guzonu onwe-unu n'ebe a, hu nzọputa Jehova, nke Ọ gēmere unu ta: n'ihi na ndi Ijipt ndi unu huworo ta, unu agaghi-ahu kwa ha ọzọ rue mb͕e ebighi-ebi.