13 O rue, n'anyasi, na nnunu quail rigotara, kpuchie ebe ọmuma-ulo-ikwū-ha: n'ututu igirigi we dikwasi n'ala buru-buru ọmuma-ulo-ikwū.
14 Mb͕e igirigi nke dikwasi n'ala rigoro, le, n'elu ọzara imurimu ihe nke ekpere ekpè, imurimu ihe dika hoar frost nke di n'elu ala.
15 Umu Israel we hu ya, sirita onwe-ha, Gini ka ọ bu? n'ihi na ha amaghi ihe ọ bu. Moses si ha, Nke ahu bu nri nke Jehova nyeworo unu ka unu rie.
16 Nka bu ihe Jehova nyere n'iwu, Chikọtanu ufọdu nime ya, onye ọ bula dika oriri-ya si di; otù ọtùtù omer otù isi, dika ọnu-ọgugu madu-unu si di, ka unu gēwere ya, onye ọ bula o were ndi nọ n'ulo-ikwū-ya.
17 Umu Israel we me otú a, chikọta, otù onye nāchikọta ri nne, nke-ọzọ nāchikọta nke ntà.
18 Ha we were omer tùa ya, onye chikọtara ri nne enweghi kari nke gēzuru ya, onye chikọta-kwa-ra nke ntà, ọ dighi ihe fọduru ya inwe; onye ọ bula dika oriri-ya si di, otú a ka ha chikọtara.
19 Moses we si ha, Ka onye ọ bula ghara ime ka ufọdu nime ya fọdu rue ututu.