16 Nka bu ihe Jehova nyere n'iwu, Chikọtanu ufọdu nime ya, onye ọ bula dika oriri-ya si di; otù ọtùtù omer otù isi, dika ọnu-ọgugu madu-unu si di, ka unu gēwere ya, onye ọ bula o were ndi nọ n'ulo-ikwū-ya.
17 Umu Israel we me otú a, chikọta, otù onye nāchikọta ri nne, nke-ọzọ nāchikọta nke ntà.
18 Ha we were omer tùa ya, onye chikọtara ri nne enweghi kari nke gēzuru ya, onye chikọta-kwa-ra nke ntà, ọ dighi ihe fọduru ya inwe; onye ọ bula dika oriri-ya si di, otú a ka ha chikọtara.
19 Moses we si ha, Ka onye ọ bula ghara ime ka ufọdu nime ya fọdu rue ututu.
20 Ma ha egeghi Moses nti; madu ufọdu nime ha we me ka ufọdu nime ya fọdu rue ututu, o we b͕a ikpuru, nēsì ísì: Moses we we iwe n'aru ha.
21 Ha we nāchikọta ya kwa-ututu, onye ọ bula dika oriri-ya si di: ma mb͕e anyanwu di ọku ọ b͕aze.
22 O rue, n'ubọchi nke-isi, na ha chikọtara nri okpukpu abua, ha nwere omer abua n'otù n'otù: ndi-isi nile nke nzukọ we bia, gosi Moses.