25 Moses we si, Rienu ya ta; n'ihi na ubọchi-izu-ike diri Jehova ka ta bu: ta unu agaghi-achọta ya n'ọhia.
26 Ubọchi isi ka unu gāchikọta ya; ma n'ubọchi nke-asa ka ubọchi-izu-ike di, ọ dighi nke gādi nime ya.
27 O rue, n'ubọchi nke-asa, na ufọdu nime ndi Israel puru apu ichikọta, ma ha achọtaghi.
28 Jehova we si Moses, Rùe ole mb͕e ka unu nāju idebe ihe nile M'nyere n'iwu na iwum nile?
29 Lenu, n'ihi na Jehova enyewo unu ubọchi-izu-ike, n'ihi nka Ya onwe-ya nēnye unu nri nke ubọchi abua n'ubọchi nke-isi; nọdunu, onye ọ bula n'ebe ọ nọ, ka onye ọ bula ghara isi n'ọnọdu-ya pua n'ubọchi nke-asa.
30 Ndi Israel we kwusi ilu ọlu n'ubọchi nke-asa.
31 Ulo Israel we kpọ aha-ya Manna: ihe ahu di ka nkpuru coriander, ọ di ọcha; idetu ya ire ọ di ka achicha wafer eji manu-aṅu me.