17 Nna nwunye Moses we si ya, Ọ dighi nma, bú ihe gi onwe-gi nēme.
18 I ghaghi ikpọnwu akpọnwu dika akwukwọ, ma gi onwe-gi ma ndi nka gi na ha nọ: n'ihi na ọ di arọ́ kari gi, bú ihe a; i pughi ime ya nání gi iche.
19 Ub͕u a ge nti n'olum, m'gādu gi ọdu, ka Chineke nọyere kwa gi: gi onwe-gi buru ndi nka na ncherita-iru Chineke, gi onwe-gi webata-kwa-ra Chineke okwu nile,
20 me kwa ka ha ghọta ukpuru nile na iwu nile, gi me kwa ka ha mara uzọ ha gēje ije nime ya, na ọlu nke ha gālu.
21 Gi onwe-gi gēsi kwa na ndi nka nile leputa ndi-dìnkpà, ndi nātu egwu Chineke, ndi nēkwu ezi-okwu, ndi nākpọ urù nēzighi ezi asì; i gēdo kwa ndi ahu n'isi ha, ibu ndi-isi nnù abua na ọgu iri nnù abua na ọgu iri, na ndi-isi ọgu ise ọgu ise, na ndi-isi ọgu abua na iri ọgu abua na iri, na ndi-isi iri iri:
22 ka ha kpe ndi nka na mb͕e nile: o gēru, na oké okwu nile ọ bula ka ha gēwetara gi, ma ha onwe-ha gēkpe okwu ntà nile ọ bula: gi me ka ọ di kari nfe n'aru gi, ha gēso kwa gi buru ibu a.
23 Ọ buru na ihe a ka i gēme, ọ buru kwa na Chineke enye gi iwu, i gēnwe kwa ike iguzo; ọzọ kwa, ndi nka nile gābà kwa n'ọnọdu-ha n'udo.